19 Ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu n'elu ya ub͕ò asa, me ya ka ọ di ọcha, do kwa ya nsọ site n'ọrurú nile nke umu Israel.
20 Mb͕e o kpuchibiri nmehie ebe nsọ a, na nke ulo-ikwū nzute, na nke ebe-ichu-àjà, ọ gēweta nso nkpi ahu di ndu:
21 Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n'isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n'elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n'elu isi nkpi ahu, zilaga ya n'ọzara site n'aka nwoke jikere ejikere:
22 nkpi ahu gēbu kwa n'aru ya ajọ omume-ha nile rue ala nkewapu: o gēzilaga kwa nkpi ahu n'ọzara.
23 Eron gābata kwa n'ulo-ikwū nzute, yipu uwe ákwà ọcha ahu nile, nke o yiri mb͕e ọ batara n'ebe nsọ a, ọ gāwusa ha n'ebe ahu:
24 ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya n'ebe di nsọ, o gēyiri kwa uwe-ya nile, puta, me àjà-nsure-ọku-ya na àjà-nsure-ọku nke ndim, kpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ndim, nmehie-ha.
25 Abuba àjà-nmehie ahu, o gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà.