24 ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya n'ebe di nsọ, o gēyiri kwa uwe-ya nile, puta, me àjà-nsure-ọku-ya na àjà-nsure-ọku nke ndim, kpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ndim, nmehie-ha.
25 Abuba àjà-nmehie ahu, o gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà.
26 Onye nēzilaga nkpi ka ọ buru ewu-ọpupu gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.
27 Oke-ehi àjà-nmehie ahu kwa, na nkpi àjà-nmehie ahu, nke ewebatara ọbara-ha ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, agēbupu ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ha gēsure kwa akpukpọ-ha na anu-ha na nsi-ha nime ọku.
28 Onye nēsure ha ọku gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.
29 Ọ gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi: n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, unu gēweda nkpuru-obi-unu n'ala, ghara kwa ije ozi ọ bula, ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu:
30 n'ihi na n'ubọchi a ka agēkpuchiri unu nmehie-unu, ime ka unu di ọcha; site na nmehie nile unu ka unu gādi ọcha n'iru Jehova.