11 Ọtọ nwa-nwayi nke nwunye nna-gi, nke nna-gi muru, nwa-nne-gi nwayi ka ọ bu, ekpughela ọtọ-ya.
12 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nna-gi: onye-aru nna-gi ka ọ bu.
13 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nne-gi: n'ihi na onye-aru nne-gi ka ọ bu.
14 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-gi, abiarula nwunye-ya nso: nwunye nwa-nne nna-gi ka ọ bu.
15 Ekpughela ọtọ nwunye nwa-gi: nwunye nwa-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya.
16 Ekpughela ọtọ nwunye nwa-nne-gi: ọtọ nwa-nne-gi ka ọ bu.
17 Ekpughela ọtọ nwanyi na nwa ya nwanyi; ekurula nwa-nwanyi nke nwa-ya nwoke, ma-ọbu nwa-nwayi nke nwa ya nwanyi, ikpughe ọtọ-ya; ndi-aru ka ha bu: nzube ọjọ ka ọ bu.