4 Ikpém nile ka unu gēme, ọ bu kwa ukpurum nile ka unu gēdebe, ijeghari nime ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
5 Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke madu gēme, di ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova.
6 Nwoke ọ bula abiarula nso onye-aru-ya ọ bula, ikpughe ọtọ-ya: Mu onwem bu Jehova.
7 Ekpughela ọtọ nna-gi, bú ọtọ nne-gi: nne-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya.
8 Ekpughela ọtọ nwunye nna-gi: ọtọ nna-gi ka ọ bu.
9 Ọtọ nwa-nne-gi nwayi, bú nwa nke nna-gi ma-ọbu nwa nke nne-gi, nke amuru n'ulo, ma-ọbu nke amuru n'èzí, ekpughela ọtọ-ha.
10 Ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwoke, ma-ọbu ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwayi, ekpughela ọtọ-ha: n'ihi na ọtọ-gi ka ọtọ-ha bu.