5 Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà nké àjà-udo, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.
6 N'ubọchi unu churu ya ka agēri ya, ya na echi-ya: ma nke fọduru rue ubọchi nke-atọ, n'ọku ka agēsure ya.
7 Ma ọ buru na erie ya ma-ọli n'ubọchi nke-atọ, ihe-árú ka ọ bu; ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ:
8 ma onye nēri ya gēbu ajọ omume-ya, n'ihi na ihe nsọ nke Jehova ka o meworo ka ọ ghara idi nsọ: aga ebipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya.
9 Ma mb͕e unu nēwe ihe-ubi nke ala-unu, ewesila ihe di n'akuku ubi-gi, achikọta-kwa-la ihe-nchikọta nke owuwe-ihe-ubi-gi fọduru
10 Atutukọ-kwa-la nkpuru ubi-vine-gi fọduru, achikota-kwa-la nkpuru dara ada n'ubi-vine-gi; ob͕eye na ọbìa ka i gārapuru ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
11 Unu ezula ori; unu aghọ-kwa-la aghughọ, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha, otù n'ebe ibe-ya nọ.