17 Nwoke ọ bula nke nēkuru nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-nwayi nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nne-ya, we hu ọtọ-ya, nwayi ahu we hu ọtọ-ya; ihe-ihere ka ọ bu; agēbipu kwa ha n'anya umu ndi-ha: ọtọ nwa-nne-ya nwayi ka o kpugheworo; o gēbu ajọ omume-ya.
18 Nwoke ọ bula nke ya na nwayi nke nāsọ uba nēdina, nke gēkpughe kwa ọtọ-ya; isi ọbara nwayi ahu ka ọ b͕abaworo ọtọ, nwayi ahu ekpughewo kwa isi ọbara nke ya onwe-ya: agēbipu kwa ha abua n'etiti ndi-ya.
19 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwayi nke nne-gi, ma-ọbu ọtọ nke nwa-nne-nwayi nke nna-gi: n'ihi na onye-aru-ya ka ọ b͕abaworo ọtọ: ha gēbu ajọ omume-ha.
20 Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-nne nke nna-ya nēdina, ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-ya ka o kpugheworo: nmehie-ha ka ha gēbu; ha gāb͕a aka nwa nwua.
21 Nwoke ọ bula nke nēkuru nwunye nwa-nne-ya, ihe isọ nsọ ka ọ bu: ọtọ nwa-nne-ya nwoke ka o kpugheworo; ha gāb͕a aka nwa.
22 Unu gēdebe kwa ukpurum nile, na ikpém nile, me ha: ka ọ we ghara ibọputa unu, bú ala ahu nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu ibi nime ya.
23 Unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile nke mba ahu, nke Mu onwem nāchupu n'iru unu: n'ihi na ihe ndia nile ka ha mere, ike ha we gwusiam.