1 Jehova we gwa Moses okwu n'ugwu Sainai, si,
2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala nke Mu onwem nēnye unu, ala ahu gēdebe-kwa-ra Jehova ubọchi-izu-ike.
3 Arọ isi ka i gāgha nkpuru n'ubi-gi, arọ isi ka i gākwacha osisi ubi-vine-gi, chikọta kwa ihe-ọmume-ya;
4 ma n'arọ nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādiri ala ahu, bú ubọchi-izu-ike agēdebere Jehova: aghala nkpuru n'ubi-gi, akwacha-kwa-la osisi ubi-vine-gi.