7 anu-ulo-gi, na anu-ọhia nke di n'ala-gi, gēnwe kwa ihe-ọmume-ya nile n'ihe-oriri.
8 I gāgu-kwa-ra onwe-gi ubọchi-izu-ike asa, bú arọ, arọ asa ub͕ò asa; ubọchi nke ubọchi-izu-ike asa, bú arọ arọ, gābu-kwa-ra gi ọgu arọ abua na iteghete.
9 I gēme kwa ka opì-ike nke nādasi uda ike gābiga rue ebe nile n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu; n'ubọchi nkpuchi-nmehie ka unu gēme ka opì-ike gabiga n'ala-unu nile.
10 Unu gēdo kwa arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu nsọ, kpọsa kwa n'ala ahu nile si na ndi nile bi nime ya nwere onwe-ha: jubile ka arọ ahu gāburu unu; unu gālaghachi kwa, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, laghachi kwa, onye ọ bula n'ab͕uru-ya.
11 Jubile ka arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu gāburu unu: unu aghala nkpuru, unu ewe-kwa-la ihe-ubi nēpu n'onwe-ya nime ya, unu aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine nile anākwachaghi akwacha.
12 N'ihi na jubile ka ọ bu; nsọ ka ọ gādiri unu: unu gēsite n'ubi rie ihe-ọmume-ya.
13 N'arọ jubile a ka unu gālaghachi, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya.