6 M'gēnye udo n'ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n'ala-unu.
7 Unu gāchu ndi-iro-unu, ha gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.
8 Madu ise n'etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n'etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.
9 M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ.
10 Unu gēri ihe ochie nke anēdebe site na mb͕e ochie, unu gēweputa kwa nke-ochie n'iru nke-ọhu.
11 M'gētiye ebe-obibim n'etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi.
12 M'ganējeghari n'etiti unu, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi.