7 Unu gāchu ndi-iro-unu, ha gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.
8 Madu ise n'etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n'etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.
9 M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ.
10 Unu gēri ihe ochie nke anēdebe site na mb͕e ochie, unu gēweputa kwa nke-ochie n'iru nke-ọhu.
11 M'gētiye ebe-obibim n'etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi.
12 M'ganējeghari n'etiti unu, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi.
13 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt, si kwa n'iburu ha ndi-orù, puta; M'tijiwo kwa nkpọrọ nile nke yoke-unu, me kwa ka unu je ije iguzo-ọtọ.