12 onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ: dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, gi onye-nchu-àjà, otú a ka ọ gādi.
13 Ma ọ buru na ọ gāb͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise ya n'ọ̀rùrù-ọnu-gi.
14 Ọzọ, mb͕e onye ọ bula gēdo ulo-ya nsọ idiri Jehova nsọ, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ulo ma-ọbu ulo ọjọ: dika onye-nchu-àjà gārù ya ọnu, otú a ka o gēguzo.
15 Ọ buru kwa na onye ahu nke nēdo ya nsọ ab͕aputa ulo-ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, ọ gābu kwa nke ya.
16 Ma ọ buru na onye ọ bula ewere ufọdu nime ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya doro Jehova nsọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gādi kwa ka nkpuru-ọghigha-ya si di; otù homer nke nkpuru-ọghigha ọka barley, agārù ọnu-ya n'ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri.
17 Ọ buru na o sitere n'arọ jubile do ala-ubi-ya nsọ, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di ka o gēguzo.
18 Ma ọ buru na o do ala-ubi-ya nsọ mb͕e jubile gasiri, onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ego-ya dika arọ fọduru iru arọ jubile si di, agāgubì kwa ihe n'ọ̀rùrù-ọnu-gi.