3 Ọgugu ọnu gi gābu kwa nke nwoke site n'onye b͕ara orú arọ we rue onye b͕ara ọgu aro atọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa ọgu shekel ọla ọcha abua na iri, dika shekel nke ebe nsọm si di.
4 Ma ọ buru na nwayi ka ọ bu, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa orú shekel na iri.
5 Ma ọ buru na ọ bu site n'onye b͕ara arọ ise we rue onye b͕ara orú arọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa orú shekel, ma ọ gāburu nwayi shekel iri.
6 Ma ọ buru na ọ bu site n'onye ruru otù ọnwa we rue onye b͕ara arọ ise, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa shekel ọla-ọcha ise, ma shekel ọla-ọcha atọ ka ọ̀rùrù-ọnu-gi gāburu nwayi.
7 Ma ọ buru na ọ bu site n'onye b͕ara ọgu arọ atọ we gaba n'iru; ọ buru na ọ bu nwoke, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa shekel iri na ise, ma ọ gāburu nwayi shekel iri.
8 Ma ọ buru na onye dara ob͕eye ka ọ bu kari ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēguzo kwa ya n'iru onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu; dika aka onye ahu nke nēkwe nkwa ruru ka onye-nchu-àjà gārù ya ọnu.
9 Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo, nke madu nēsite na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ihe ọ bula madu gēsite na ya nye Jehova gādi nsọ.