7 Ma ọ buru na ọ bu site n'onye b͕ara ọgu arọ atọ we gaba n'iru; ọ buru na ọ bu nwoke, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa shekel iri na ise, ma ọ gāburu nwayi shekel iri.
8 Ma ọ buru na onye dara ob͕eye ka ọ bu kari ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēguzo kwa ya n'iru onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu; dika aka onye ahu nke nēkwe nkwa ruru ka onye-nchu-àjà gārù ya ọnu.
9 Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo, nke madu nēsite na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ihe ọ bula madu gēsite na ya nye Jehova gādi nsọ.
10 Ọ gaghāb͕anwe ya, ọ gaghi-enwo kwa ya, ezi ihe n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe: ma ọ buru na o were anu-ulo nwo anu-ulo ma-ọli nke ahu di kwa nsọ, ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ.
11 Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo ọ bula ruru árú, nke ha nēsiteghi na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ọ gēme kwa ka anu-ulo ahu guzo n'iru onye-nchu-àjà:
12 onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ: dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, gi onye-nchu-àjà, otú a ka ọ gādi.
13 Ma ọ buru na ọ gāb͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise ya n'ọ̀rùrù-ọnu-gi.