2 ma-ọbu mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, ma ọ bu ozu anu-ọhia ruru árú, ma-ọbu ozu anu-ulo ruru árú, ma-ọbu ozu ihe nēnuputa enuputa nke ruru árú, ma ezonariri ya ya, ya onwe-ya ewe ru kwa árú, ikpe gāma kwa ya:
3 ma-ọbu mb͕e ọ gēmetu ihe ruru árú nke madu, ọbuná ihe ọ bula nke ya ruru árú nke eji meru ya, ma ezonariri ya ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya:
4 ma-ọbu mb͕e madu gāṅu iyi, nēwere eb͕ub͕ere-ọnu-ya kwu okwu efu ime ihe ọjọ, ma-ọbu ime ezi ihe, ọbuná okwu efu ọ bula madu nēkwu n'iṅu iyi, ma ezonariri ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya bayere otù nime ihe ndia:
5 o gēru kwa, mb͕e ikpe mara ya bayere otù nime ihe ndia, na o gēkwuputa ihe ahu nke ọ mehieworo nmehie bayere ya:
6 ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, bú nne nke si n'ìgwè ewu na aturu puta, nwa-aturu ma-ọbu nwa-ewu, ka ọ buru àjà-nmehie; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu.
7 Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, o gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie nke ọ mehieworo, bú nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.
8 Ọ gāchitara ha onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēburu uzọ weta nso nke diri àjà-nmehie, ọ gātubipu isi-ya site n'olu-ya, ma ọ gaghi-ekewa ya.