1 Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, we bilie, ya na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, ha we lua ọnu-uzọ-ama aturu; ha onwe-ha doro ya nsọ, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya; ọbuná rue ulo-elu Hamea ka ha doro ya nsọ, rue ulo-elu Hananel.
2 N'akuku ya ka ndikom Jeriko luru. N'akuku ha ka Zakua nwa Imri luru.
3 Ọnu-uzọ-ama azù ka umu Hasenaa luru; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.
4 N'akuku ha ka Meremot nwa Uraia, nwa Hakoz, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Meshulam nwa Berekaia, nwa Meshezabel, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Zedok nwa Beana mere ka mb͕idi di ike.
5 N'akuku ha ka ndi Tekoa mere ka mb͕idi di ike; ma ndi-ha ndi di ebube etiyeghi olu-ha n'òfùfè Onye-nwe-ha.
6 Ọnu-uzọ-ama ochie ka Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia mere ka ọ di ike; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.