19 ma Gi onwe-gi n'ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n'ọzara: ogidi igwe-oji esighi n'elu ha wezuga onwe-ya n'ehihie, idu ha n'uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n'abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè.
20 I nye-kwa-ra ezi Mọ nke Gi ime ka ha nwe uche, I b͕ochighi kwa manna-Gi n'ọnu-ha, I nye-kwa-ra ha miri bayere akpiri-ikpọ-nku-ha.
21 Ọ bu kwa ọgu arọ abua ka I zùru ha n'ọzara, ọ dighi kwa ihe kọrọ ha; uwe-ha akaghi nká, ukwu-ha azaghi kwa aza.
22 Ọzọ, I nyere ha ala-eze na ndi di iche iche, we kè ha n'òkè n'òkè n'akuku nile: ha we nweta ala Saihon, bú ala nke eze Heshbon, na ala Og, bú eze Beshan.
23 I me-kwa-ra ka umu-ha ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, I we me ka ha ba n'ala ahu nke I siri ndi bu nna-ha ka ha ba inweta ya.
24 Umu-ha we ba, nweta ala ahu, I we ruru ndi bi n'ala ahu, bú ndi Kenean, ala n'iru ha, were ha, na ndi-eze-ha, na ndi di iche iche nke ala ahu, nye n'aka-ha, ka ha were ha me dika ọ tọrọ ha utọ
25 Ha we were obodo di iche iche ewusiri ike, na ala nwere ume, ha nweta-kwa-ra ulo juputara n'ezi ihe nile, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, na ubi-vine, na ubi-olive, na ọtutu osisi nāmi nkpuru anēri eri: ha we rie ihe, afọ ju-kwa-ra ha, ha we gba abuba, ezi ihe uku Gi we tọ ha utọ.