35 Ha onwe-ha efèghi kwa Gi n'ala-eze-ha, na n'ezi ihe-Gi bara uba nke I nyere ha, na n'ala ahu sara mbara nke nwe-kwa-ra ume, nke I tiyere n'iru ha, ha esighi kwa n'omume ọjọ nile ha chigharia.
36 Le, ayi onwe-ayi bu ndi-orù ta, ma ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya, le, ayi onwe-ayi bu ndi-orù nime ya.
37 Ọ nēme-kwa-ra ndi-eze ọtutu ihe-ọmume, bú ndi I doro ndi-isi-ayi n'ihi nmehie nile ayi: ha nāchi kwa aru-ayi, na n'etiti anu-ulo-ayi, dika ọ nātọ ha utọ, ọ bu kwa na nkpab͕u uku ka ayi nọ.
38 Ma n'ihi ihe a nile ka ayi onwe-ayi nēme ọb͕ub͕a-ndu kwesiri ntukwasi-obi, ayi nēde kwa ya n'akwukwọ; ndi-isi-ayi na ndi Livai ayi na ndi-nchu-àjà-ayi bu kwa ndi-isi n'ikà ihe ahu akara akàrà.