1 Jehova we gwa Moses okwu, si,
2 Mere onwe-gi opì ọla ọcha abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha: ha gābu-kwa-ra gi ihe bayere nkpọkọta nzukọ Israel, na ihe bayere nbuli-ije nke omuma-ulo-ikwū nile ha.
3 Mb͕e ha gēwere ha fùa, nzukọ Israel nile gēzukọ n'ebe i nọ rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.
4 Ma ọ buru na otù ka ha were fùa, ndi-isi, bú ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, gēzukọ kwa n'ebe i nọ.