Ọnu-Ọgugu 17 IGBOB

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, nara kwa n'aka-ha nkpa-n'aka nkpa-n'aka, otù diri otù ulo nna, n'aka ndi-isi ha nile, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nkpa-n'aka iri-na-abua: aha nwoke ọ bula ka i gēdekwasi na nkpa-n'aka-ya

3 Ma aha Eron ka i gēdekwasi na nkpa-n:aka Livai: n'ihi na ọ bu otù nkpa-n'aka ka onye-isi ọ bula nke ulo nke ndi bu nna-ha gēnwe.

4 I gēdo kwa ha n'ulo-ikwū n'iru ihe-àmà ahu, ebe Mu na unu nēzute.

5 O gēru kwa, na nwoke ahu nke M'gārọputa, nkpa-n'aka-ya gāma ifuru: M'gēme kwa ka ntamu nile nke umu Israel si n'arum bìe, bú nke ha onwe-ha nātamu megide unu.

6 Moses we gwa umu Israel okwu, ndi-isi-ha nile we nye ya nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di nkpa-n'aka iri na abua: nkpa-n'aka Eron di kwa n.etiti nkpa-n'aka-ha.

7 Moses we do nkpa-n'aka nile n'iru Jehova n'ulo-ikwū nke ihe-àmà.

8 O rue n'echi-ya, na Moses bara n'ulo-ikwū nke ihe-àmà; ma, le, nkpa-n'aka Eron nke diri ulo Livai amawo ifuru, b͕awa kwa ifuru ahu, wa kwa okoko, mì kwa almond chara acha.

9 Moses we si n'iru Jehova chiputara umu Israel nile nkpa-n'aka ahu nile: ha we le anya, were ha, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya.

10 Jehova we si Moses, Doghachi nkpa-n'aka Eron n'iru ihe-àmàm ka ọ buru ihe-ndebe, iburu umu nnupu-isi ihe-iriba-ama; ka i we me ka ntamu nile ha si n'ebe M'nọ bìsia, ka ha we ghara inwu.

11 Moses we me ya: dika Jehova nyere ya iwu, otú a ka ọ mere.

12 Umu Israel we gwa Moses okwu, si, Le, ayi ekubìwo, ayi alawo n'iyì, ayi nile alawo n'iyì.

13 Onye ọ bula nke nābiaru nso, nke nābiaru nso ebe-obibi Jehova, gānwu: ọ̀ bu na ayi agwusiwo n'ikubì ekubì?

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36