Ọnu-Ọgugu 24 IGBOB

1 Ma mb͕e Belam huru na ọ di nma n'anya Jehova igọzi Israel, ọ jeghi, dika o si eje ub͕ò ub͕ò, izute ọb͕ub͕a-afa di iche iche, ma o chere iru-ya n'ọzara.

2 Belam we welie anya-ya abua, hu Israel ka ha nānọ n'ulo-ikwū-ha dika ebo nile ha si di; Mọ nke Chineke we dikwasi ya.

3 Ọ we tua ilu-ya, si,Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta,Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:

4 Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile,Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:

5 Le ka ulo-ikwū-gi nile si ma nọ̄ nma, Jekob!Le ka ebe-obibi-gi nile si ma nọ̄ nma, Israel!

6 Dika ndagwurugwu di iche iche ka esetiworo ha,Dika ubi di iche iche ab͕ara ogige n'akuku osimiri,Dika osisi lign-aloes nke Jehova kuworo,Dika osisi cedar n'akuku miri.

7 Miri nēsi n'ite-miri-ya nile rùputa,Nkpuru-ya gādi kwa n'ọtutu miri,Eze-ya gādi kwa elu kari Egag,Agēbuli kwa ala-eze-ya.

8 Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta;Ume dika ume atu ka ọ nwere:O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya,Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha,Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.

9 Ọ makpuru, o dinara dika ọdum,Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?Onye ọ bula nke nāgọzi gi bu onye agọziri agọzi,Onye ọ bula nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu.

10 Iwe Belak we di ọku megide Belam, ọ kua aka-ya abua: Belak we si Belam, Ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kpọrọ gi, ma, le, i gọziwo ha nọ̄ ub͕ò atọ ndia.

11 Ma ub͕u a, b͕alaga n'onwe-gi la n'ebe nke gi: asirim na m'gāsọpuru gi nke-uku; ma, le, Jehova eb͕ochiwo gi na nsọpuru.

12 Belam we si Belak, Ọ̀ bughi kwa ndi-ozi-gi, bú ndi i ziterem, ka m'gwara okwu, si,

13 Ọ buru na Belak enyem ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu Jehova, ime ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ site n'obi nke akam, ihe nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēkwu?

14 Ma ub͕u a, le, anamalakuru ndim: bia, m'gādu gi ọdu ihe ndi nka gēme ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.

15 Ọ we tua ilu-ya, si,Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta,Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:

16 Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,Onye nāma kwa ihe-ọmuma nke Onye kachasi ihe nile elu,Ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile ka ọ nāhu,Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:

17 Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a:Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso:Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije,Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie,We mapue akuku nile nke Moab,Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,

18 Edom gābu kwa ihe-nnweta,Sia gābu kwa ihe-nnweta, bú ndi-iro-ya;Israel nēme kwa ihe-dìnkpà.

19 Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile,Ọ geme kwa ka ndi foduru si n'obodo lapu n'iyì.

20 Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si,Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu;Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.

21 Ọ we hu ndi-Kinait, we tua ilu-ya, si,Ebe nke nādigide adigide ka ebe-obibi-gi di,Etiye-kwa-ra akwu-gi na nkume di elu.

22 Ma otú ọ di, Ken gābu ihe irechapu ọku,Rùe ole mb͕e? Asiria gādọta gi n'agha.

23 Ọ we tua ilu-ya, si,Ewū! ònye gādi ndu site na mb͕e Chineke nēdo ya?

24 Ma ub͕ọ ufọdu gēsi n'akuku Kitim bia,Ha gēweda kwa Asiria n'ala, weda kwa Iba n'ala,Ọzọ kwa, ya onwe-ya gābiaru ila-n'iyì.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36