Ọnu-Ọgugu 20 IGBOB

1 Umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we ba n'ọzara Zin n'ọnwa mbu: ndi Israel we nọdu na Kedesh; Miriam we nwua n'ebe ahu, ewe lìe ya n'ebe ahu.

2 Ma ọ dighi miri nzukọ ahu nwere: ha we kpọkọta onwe-ha megide Moses, megide kwa Eron.

3 Ndi Israel we so Moses se okwu, ha we kwue, si, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ekubiwo mb͕e umu-nne-ayi kubiri n'iru Jehova!

4 Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu meworo nkpọkọta Jehova ka ọ ba n'ọzara nka, inwu n'ebe ahu, ayi onwe-ayi na anu-ulo-ayi?

5 Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigoputa, ime ayi ka ayi bata n'ebe ọjọ a? ọ bughi ebe nke nkpuru-ọghigha, ma-ọbu nke osisi fig, ma-ọbu nke osisi vine, ma-ọbu nke osisi pomegranate; ọ dighi kwa miri iṅu.

6 Moses na Eron we si n'iru nkpọkọta ahu biarute ọnu-uzọ ulo-Ikwū nzute, da kpue-iru-ha n'ala: ewe me ka ha hu ebube Jehova anya.

7 Jehova we gwa Moses okwu, si,

8 Were nkpa-n'aka ahu, kpọkọta kwa nzukọ Israel, gi onwe-gi, na Eron, bú nwa-nne-gi, unu gwa nkume ahu di elu okwu n'anya-ha, ka ọ we nye miri-ya; i gēme kwa ka miri si na nkume ahu di elu putara ha: i gēme kwa ka nzukọ ahu na anu-ulo-ha ṅua miri.

9 Moses we si n'iru Jehova were nkpa-n'aka ahu, dika O nyere ya iwu.

10 Moses na Eron we kpọkọta nkpọkọta Israel rue iru nkume ahu di elu, ọ si ha, Biko, nurunu, ndi nenupu isi, àyi gēme ka miri si na nkume a di elu putara unu?

11 Moses we welie aka-ya were nkpa-n'aka-ya tie nkume ahu di elu ub͕ò abua: miri riri nne we puta, nzukọ ahu we ṅua, ha na anu-ulo nile ha.

12 Jehova we si Moses na Eron, N'ihi na unu ekweghi na Mu, idom nsọ n'anya umu Israel, n'ihi ya unu agaghi-eme ka nkpọkọta nka ba n'ala ahu nke M'nyeworo ha.

13 Ndia bu miri Meriba; n'ihi na umu Israel soro Jehova se okwu, ewe do Ya nsọ nime ha.

14 Moses we si na Kedesh zigara eze Edom ndi-ozi, si, Otú a ka Israel, bú nwa-nne-gi, siri, Gi onwe-gi amawo ike-ọgwugwu nile nke gwuworo ayi:

15 na nna-ayi-hà ridara n'Ijipt, ayi we biri n'Ijipt ọtutu ubọchi; ndi Ijipt we mejo ayi, mejọ kwa nna-ayi-hà:

16 ayi we tikue Jehova, O we nu olu-ayi, zite mọ-ozi, me ka ayi si n'Ijipt puta: ma, le ayi onwe-ayi nọ na Kedesh, bú obodo nke di na nsọtu ókè-ala-gi:

17 biko, ka ayi gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-agabiga nime ọhia ma-ọbu nime ubi-vine, ayi agaghi-aṅu kwa miri olùlù: n'uzọ eze ka ayi ganēje, ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè-ala-gi.

18 Edom we si ya, I gaghi-agabiga nimem, ka m'we ghara iwere mma-agha puta izute gi.

19 Umu Israel we si ya, Ọ bu n'uzọ atuliri atuli ka ayi gārigo: ọ buru kwa na ayi aṅua miri-gi, mu onwem na anu-ulom, m'gēnye kwa gi ọnu-ahia-ya: nání ka m'were ukwum gabiga, ọ dighi ọzọ.

20 O we si, I gaghi-agabiga. Edom we were ndi di uku aka di ike puta izute ya.

21 Edom we ju ikwe ka Israel gabiga n'ókè-ala-ya: Israel we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.

22 Ha we si na Kedesh bulie ije: umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we biarue ugwu Hoa.

23 Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ugwu Hoa, n'akuku ókè ala Edom si,

24 Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ' n'ihi na ọ gaghi-abà n'ala ahu nke M'nyeworo umu Israel, n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum na miri Meriba.

25 Chiri Eron na Eleeza nwa-ya, me ka ha rigota n'ugwu Hoa:

26 i gēyipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya: agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ gānwu kwa n'ebe ahu.

27 Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: ha we rigo n'ugwu Hoa n'anya nzukọ Israel nile.

28 Moses we yipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya; Eron we nwua n'ebe ahu n'elu ugwu ahu: Moses na Eleeza we si n'ugwu ahu ridata.

29 Nzukọ Israel nile we hu na Eron ekubiwo, ha we kwara Eron ákwá orú ubọchi na iri, bú ulo Israel nile.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36