Ọnu-Ọgugu 6 IGBOB

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ọ gālu oké ọlu n'ikwe nkwa onye-Nazirait, ikewaputara Jehova onwe-ya:

3 na manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ọ gēkewaputa onwe-ya; ọ gaghi-aṅu manya-vine b͕ara uka, ma-ọbu ihe- ọṅuṅu nābà n'anya b͕ara uka, ọ gaghi-aṅu kwa miri nkpuru-vine ọ bula, ọ gaghi-eri kwa nkpuru-vine ọhu ma-ọbu nke amikọrọ amikọ.

4 Ubọchi nile nke nkewaputa-ya ọ dighi ihe nime ihe ọ bula emere site n'osisi vine nke manya-vine o gēri, site na nkpuru-ime-ya we rue mb͕ub͕ọ-ya.

5 Ubọchi nile nke nkwa nkwaputa-ya ọ dighi aguba gāgabiga n'isi-ya: rue ozùzù ubọchi nile, nke ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya nsọ ka ọ gādi, ọ gēme ka ntutu agiri-isi-ya to ogologo.

6 Ubọchi nile ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya ọ dighi madu nwuru anwu ọ gābiaru nso.

7 Ọ gaghi-emeru onwe-ya bayere nna-ya, ma-ọbu bayere nne-ya, ma-ọbu bayere nwa-nne-ya nwoke, maọbu bayere nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ha nwuru; n'ihi na nkewaputa Chineke-ya di n'isi-ya.

8 Ubọchi nile nke nkewaputa-ya nsọ ka ọ diri Jehova.

9 Ma mb͕e onye nwuru anwu gānwu n'akuku-ya na ntabi-anya, na mberede, o we merua isi nkewaputa-ya; ọ gākọpu kwa isi-ya n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha, n'ubọchi nke-asa ka ọ gakọpu ya.

10 N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwetara onye-nchu-àjà nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

11 Onye-nchu-àjà gēme otù ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, o gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, n'ihi nmehie nke ọ mehiere site na madu ahu nwuru anwu, o gēdo kwa isi-ya nsọ n'ubọchi ahu.

12 Ọ gēkewaputa-kwa-ra Jehova ubọchi nile nke nkewaputa-ya, weta kwa nwa-ebulu b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma: ma ubọchi mbu nile alawo n'iyì, n'ihi na nkewaputa-ya ruru árú.

13 Nka bu kwa iwu onye-Nazirait, n'ubọchi ozùzù nke ubọchi nile nke nkewaputa-ya: agēme ka ọ bia n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute:

14 ọ gēweta kwa nso Jehova onyinye-ya iji biaru nso, otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, na otù nwa-nne-aturu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nmehie, na otù ebulu zuru okè ka ọ buru àjà-udo,

15 na nkata achicha ekoghi-eko, ob͕e achicha nke utu ọka flour agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na onyinye-inata-iruọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.

16 Onye-nchu-àjà gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, me àjà-nmehie-ya, na àjà-nsure-ọku-ya:

17 ọ gēme kwa ebulu ahu ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo anāchuru Jehova, tiyere nkata achicha ekoghi-eko ahu: onye-nchu-àjà gēme kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

18 Onye-Nazirait ahu gākọpu kwa isi nke nkewaputa-ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ọ gēwere kwa agiri-isi nke isi nke nkewaputa-ya, tiye ya n'elu ọku nke di n'okpuru ihe àjà nke àjà-udo ahu.

19 Onye-nchu-aja gēwere ọkwa-aka esiri esi nke ebulu ahu, na otù ob͕e achicha ekoghi-eko sitere na nkata ahu, na otù mbadamba-achicha ekoghi-eko, tiye ha n'elu ọbu-aka abua nke onye-Nazirait ahu, mb͕e ọ kọpusiri isi nke nkewaputa-ya:

20 onye-nchu-àjà gēfé kwa ha ibu àjà-ofufé n'iru Jehova; ihe nsọ ka ọ buru onye-nchu-àjà, tiyere okpukpu-obi nke àjà-ofufé, tiye-kwa-ra utaku-ukwu nke àjà-nbuli: emesia onye-Nazirait ahu gāṅu manya-vine.

21 Nka bu iwu onye-Nazirait onye nēkwe nkwa, na nke onyinye-ya iji biarue Jehova nso bayere nkewaputa-ya, nāgughi ihe aka-ya gēru: dika nkwa-ya si di, nke ọ nekwe, otú a ka ọ gēme n'iwu nkewaputa-ya.

22 Jehova we gwa Moses okwu, si,

23 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si Otú a ka unu gāgọzi umu Israel; unu gāsi ha,

24 Jehova gọzie gi, debe gi:

25 Jehova me iru-Ya ka ọ mukwasi gi, Jehova me-kwa-ra gi amara:

26 Jehova bulie iru-Ya n'aru gi, nye gi udo.

27 Ha gātukwasi kwa aham n'aru umu Israel; Mu onwem gāgọzi kwa ha.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36