Ọnu-Ọgugu 23 IGBOB

1 Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a.

2 Belak we me dika Belam kwuru; Belak na Belam we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.

3 Belam we si Belak, Guzo onwe-gi n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma ka m'je; eleghi anya Jehova gābia izutem: ma ihe ọ bula Ọ gēme ka m'hu m'gēgosi kwa gi ya. Ọ we je ugwu nke ọhia nādighi.

4 Chineke we zute Belam: ọ we si Ya, Ebe-ichu-àjà asa ahu ka m'doworo n'usoro, m'we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-aja ọ bula.

5 Jehova we tiye okwu n'ọnu Belam, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.

6 Ọ we jeghachikuru ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya onwe-ya na ndi-isi Moab nile.

7 O we tua ilu-ya, si,N'Eram ka Belak nēsi dutem,Eze Moab si n'ugwu Iru-anyanwu dutem: si,Bia, buaram Jekob ọnu,Bia kwa, wesa Israel iwe.

8 Gini, m'gākọcha? Chineke akọchaghi.Gini kwa m'gēwe iwe? Jehova eweghi iwe.

9 N'ihi na n'elu oké nkume ndia ka m'si ahú ya,Ọ bu kwa n'ugwu ntà ndia ka m'si ekiri ya:Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche,Ọ dighi-agu onwe-ya n'etiti mba nile.

10 Ònye gutaworo ájá Jekob,Na ọnu-ọgugu nke otù uzọ n'uzọ anọ nke Israel?Ka mu onwem nwua, ọnwu nke ndi ziri ezi,Ka ikpe-azum di kwa ka nke ya!

11 Belak we si Belam, Gini ka i meworom? ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kutere gi, ma, le, i gọziwo ha nke-uku.

12 Ọ we za, si, Ihe Jehova nētiye n'ọnum, ọ̀ bughi nka ka m'gēlezi anya ikwu?

13 Belak we si ya, Biko, sorom je n'ebe ọzọ, ebe i gēsi hu ha; nání nsọtu-ha ka i gāhu, ma i gaghi-ahu ha nile: gi kọcha-kwa-ram ha site n'ebe ahu.

14 Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.

15 Ọ si Belak, Guzo onwe-gi n'ebe a n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma mu onwem gēzute Jehova n'ebe ahu.

16 Jehova we zute Belam, tiye okwu n'ọnu-ya, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.

17 Ọ we biakute ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya na ndi-isi Moab. Belak we si ya, Gini ka Jehova kwuworo?

18 Ọ we tua ilu-ya, si,Bilie, Belak, nuru kwa;Ṅam nti, nwa Zipoa:

19 Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha;Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha:Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya?Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike?

20 Le, ọ bu igọzi ka m'nataworo iwu:Ọ gọziwo kwa, apughkwam itughari ya.

21 O legideghi ajọ ihe anya nime Jekob,Ọ hughi kwa nmeb͕u n'Israel:Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya,Iti-nkpu nke eze di kwa n'etiti ha.

22 Chineke nēme ka ha si n'ala Ijipt puta;Ume dika ume atu ka ọ nwere

23 N'ihi na ọb͕ub͕a-afa adighi megide Jekob,Iju-ase adighi kwa megide Israel:Na mb͕e ahu ka agēkwu okwu bayere Jekob, baye-kwa-ra Israel, si,Le ihe Chineke meworo!

24 Le, ndi ahu nēbili dika nne-ọdum,Dika ọdum ka ọ nēweli onwe-ya:Ọ gaghi-edina rue mb͕e ọ gēri ihe ọ dọb͕utara,Ṅu kwa ọbara nke ndi eb͕uru eb͕u.

25 Belak we si Belam, Akọcha-kwa-la ha ma-ọli agọzi-kwa-la ha ma-ọli.

26 Belam we za, si Belak, Àgwaghm i, si, Ihe nile nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēme?

27 Belak we si Belam, Biko, bia, m'gēkuru gi je ebe ọzọ; eleghi anya ọ gēzi ezi n'anya Chineke ka i si n'ebe ahu kọcharam ha.

28 Belak we kuru Belam je n'elu Peoa, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di.

29 Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a.

30 Belak we me dika Belam siri, ọ we sure otù oke-ehi na otù ebulu n'ebe-ichu-aja ọ bula.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36