17 Ewe weda ebe-obibi ahu; umu Giashon na umu Merari, ndi nēbu ebe-obibi ahu, we bulie ije.
18 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elizua nwa Shedeua nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
19 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Simeon bu Shelumiel nwa Zurishadai.
20 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Gad bu Eliasaf nwa Deuel.
21 Ndi Kohat we bulie ije, nēbu ebe nsọ ahu: ma ndi ọzọ guzoro ebe-obibi ahu ọtọ rue ọbibia-ha.
22 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Efraim we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elishama nwa Amihud nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
23 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Manase bu Gameliel nwa Pedahzua.