2 Ndi Israel we tikue Moses; Moses we kpere Jehova ọku ahu we bilata.
3 Ewe kpọ aha ebe ahu Tabera: n'ihi na ọku nke Jehova nēre n'etiti ha.
4 Ìgwè ndi gwara ọgwa nke nọ n'etiti ha we chọ ajọ ọchichọ: umu Israel we kwa kwa ákwá ọzọ, si, Ònye gēme ka ayi rie anu?
5 Ayi nēcheta azù nke ayi nēri n'Ijipt nāzughi azú; ya na cucumbers na melons, na leeks, na onions, na garlic:
6 ma ub͕u a nkpuru-obi ayi akpọwo nku, ọ dighi ihe ọ bula ayi nwere: ọ bu nání manna nka di n'iru ayi.
7 Ma manna ahu, dika nkpuru coriander ka ọ bu, iru-ya di kwa ka iru bdellium.
8 Ndi Israel jeghariri, chikọta ya, were nkume-igwe-nri gwe ya, ma-ọbu na ha suru ya n'ikwè, we sie ya n'ite, me ya ka ọ buru ob͕e achicha: idetu ya ire ọ di ka idetu ihe eji manu si esi.