33 Umu-unu gābu kwa ndi-ọzùzù-aturu n'ọzara ọgu arọ abua, ha gēbu kwa ọkwukwa-iko nile unu, rue mb͕e ozu-unu gāgwusi n'ọzara.
34 Dika ọnu-ọgugu ubọchi nke unu ji ledo ala ahu anya si di, bú ọgu ubọchi abua, otù ubọchi otù arọ, otù ubochi otù arọ, otù a ka unu gēbu ajọ omume nile unu, ọgu arọ abua, unu gāma kwa iju-ajum.
35 Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, nka ka M'nāghaghi imere nzukọ ọjọ a nile, ndi nēzukọ imegidem: n'ọzara nka ka ha gāgwusi, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gānwu.
36 Ma ndikom ahu, ndi Moses zigara iledo ala ahu, ndi lata-kwa-ra, me ka nzukọ Israel nile tamu ntamu megide Ya, n'ime ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta,
37 ọbuná ndikom ahu, bú ndi nēme ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, nwuru n'ihe-otiti ahu n'iru Jehova.
38 Ma Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune di ndu site na ndikom ahu ndi jeworo iledo ala ahu.
39 Moses we gwa umu Israel nile okwu ndia: ndi Israel we rue újú nke-uku.