35 Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, nka ka M'nāghaghi imere nzukọ ọjọ a nile, ndi nēzukọ imegidem: n'ọzara nka ka ha gāgwusi, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gānwu.
36 Ma ndikom ahu, ndi Moses zigara iledo ala ahu, ndi lata-kwa-ra, me ka nzukọ Israel nile tamu ntamu megide Ya, n'ime ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta,
37 ọbuná ndikom ahu, bú ndi nēme ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, nwuru n'ihe-otiti ahu n'iru Jehova.
38 Ma Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune di ndu site na ndikom ahu ndi jeworo iledo ala ahu.
39 Moses we gwa umu Israel nile okwu ndia: ndi Israel we rue újú nke-uku.
40 Ha we bilie n'isi-ututu, rigorue elu ugwu ahu, si, Le ayi, Le ayi, ayi gārigoru kwa ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya: n'ihi na ayi emehiewo.
41 Moses we si, N'ìhi gini kwa ka unu onwe-unu nāgabiga okwu-ọnu Jehova? ma nke ahu agaghi-aga nke-ọma.