37 ọbuná ndikom ahu, bú ndi nēme ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, nwuru n'ihe-otiti ahu n'iru Jehova.
38 Ma Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune di ndu site na ndikom ahu ndi jeworo iledo ala ahu.
39 Moses we gwa umu Israel nile okwu ndia: ndi Israel we rue újú nke-uku.
40 Ha we bilie n'isi-ututu, rigorue elu ugwu ahu, si, Le ayi, Le ayi, ayi gārigoru kwa ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya: n'ihi na ayi emehiewo.
41 Moses we si, N'ìhi gini kwa ka unu onwe-unu nāgabiga okwu-ọnu Jehova? ma nke ahu agaghi-aga nke-ọma.
42 Unu arigola, n'ihi na Jehova anọghi n'etiti unu; ka ewe ghara itib͕u unu n'iru ndi-iro-unu.
43 N'ihi na ndi Amalek na ndi Kenean nọ n'ebe ahu n'iru unu, unu gāda kwa site na mma-agha: n'ihi na unu esiwo n'iso Jehova laghachi, n'ihi ya Jehova agaghi-anọyere unu.