16 Otù iwu na otù ikpé gādiri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa n'ala-unu.
17 Jehova we gwa Moses okwu, si,
18 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala ahu ebe Mu onwem nēme ka unu ba,
19 ọ gēru kwa, mgbe unu nēri nime nri ala ahu, na unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli.
20 Ob͕e achicha nke utu ọka mbu unu ka unu gēbuli, ka ọ buru àjà-nbuli: dika àjà-nbuli nke ebe-nzọcha-ọka, otú a ka unu gēbuli ya.
21 Site n'utu ọka mbu unu unu gēnye Jehova àjà-nbuli rue ọb͕ọ nile unu.
22 Ọzọ, mb͕e unu gēme ihe n'amaghi-ama, ghara kwa ime ihe ndia nile enyere n'iwu, nke Jehova gwaworo Moses,