10 Ọ we me ka i biarue nso, gi na umu-nne-gi niile, bú umu Livai? ùnu nācho kwa ọlu nchu-àjà?
11 N'ihi ya gi onwe-gi na nzukọ-gi nile bu ndi nēzukọ imegide Jehova: ma Eron, gini ka ọ bu na unu nātamu ntamu megide ya?
12 Moses we ziga ikpọ Detan na Abairam, bú umu Eliab: ha we si, Ayi agaghi-arigo:
13 ọ̀ bu ihe ntà na i mewo ka ayi si n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya rigoputa, ime ka ayi nwua n'ọzara nka, ma i ghaghi ime kwa onwe-gi onye-isi-ayi?
14 Ọzọ kwa, ọ bughi ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nēru nime ya ka i meworo ka ayi ba, i nyeghi kwa ayi ihe-nketa, bú ubi na ubi-vine: ì gārukpọ anya ndikom ndia? ayi agaghi-arigo.
15 Moses we we iwe di ọku nke-uku, ọ we si Jehova, Echela onyinye-inata-iru-ọma-ha iru: ọ dighi otù inyinya-ibu m'naraworo n'aka-ha, ọ dighi kwa otù onye nime ha M'mejọworo.
16 Moses we si Kora, Gi onwe-gi na nzukọ-gi nile nọ n'iru Jehova, gi, na ha, na Eron, echi: