11 Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-isi na ọgu ise.
12 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku-ya bu ebo Simeon: onye-isi umu Simeon nwere bu Shelumiel nwa Zurishadai:
13 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù asatọ na ọgu ise:
14 ebo Gad kwa: onye-isi umu Gad nwere bu Eliasaf nwa Reuel:
15 usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri.
16 Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben di orú nnù uzọ iri na asatọ, na nnù iri-na-asatọ, na ọgu iri-na-abua, na iri, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-abua n'ibuli ije.
17 Ulo-ikwū nzute gēbuli kwa ije, ya na ọmuma-ulo-ikwū ndi Livai, n'etiti ọmuma-ulo-ikwū nile: dika ha si ama ulo-ikwū-ha, otú a ka ha gēbuli ije, nwoke ọ bula n'akuku-ya, dika ọkọlọtọ nile ha si di.