10 Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot.
11 Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ọzara ahu nke di n'iru Moab, n'uzọ ọwuwa-anyanwu.
12 Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Zered.
13 Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon, nke di n'ọzara, nke si n'ókè-ala ndi-Amorait aputa: n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab, n'etiti Moab na ndi-Amorait.
14 N'ihi ya ka anāsi n'akwukwọ agha di iche iche nke Jehova,Vaheb nime Sufa,Na ndagwurugwu nile nke Anon,
15 Na nkpọrube nke ndagwurugwu ahu,Bú nke nēwezuga onwe-ya n'uzọ ebe-obibi A,Nke nādabere kwa n'ókè-ala Moab.
16 Ha si n'ebe ahu jerue Bia: nke ahu bu olùlù-miri ahu nke Jehova gwara Moses okwu bayere ya, si, Chikọta ndim, M'gēnye kwa ha miri.