28 N'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua,Ire-ọku n'obodo Saihon:O ripiawo A nke Moab,Ndi-nwe ebe nile di elu nke Anon.
29 Ahuhu gādiri gi, Moab!I lawo n'iyì, gi ndi Kemosh:Ọ nyewo umu-ya ndikom, dika ndi b͕apuru ab͕apu,Nye kwa umu-ya ndinyom ije na ndọta-n'agha,N'aka Saihon, bú eze ndi-Amorait.
30 Ayi ab͕awo ha àkú; Heshbon alawo n'iyì rue Dibon,Ayi emewo ka ọ tọb͕ọrọ n'efu rue Nofa,Nke diruru Medeba.
31 Israel we biri n'ala ndi-Amorait.
32 Moses we ziga iledo Jeza, ha we were umu-obodo-ya nile, napu ndi-Amorait ndi biri n'ebe ahu ala-ha.
33 Ha we chigharia, rigo n'uzọ Bechan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha n'Edrei.
34 Jehova we si Moses, Atula egwu ya; n'ihi na ọ bu n'aka-gi ka M'nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke biri nime Heshbon.