6 Jehova we zite agwọ ahu nke yiri ọku n'etiti ndi Israel, ha we ta ndi Israel aru; ndi riri nne nwupuru n'Israel.
7 Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi ekwuwo okwu megide Jehova, megide kwa gi; gi kpere Jehova, ka Ọ we wezuga agwọ ndia n'aru ayi. Moses we kpe ekpere n'ihi ndi Israel.
8 Jehova we si Moses, Mere onwe-gi agwọ yiri ọku, tukwasi ya n'ọkọlọtọ: o gēru kwa, na onye ọ bula ataworo gādi ndu, mb͕e ọ huworo ya anya.
9 Moses we me agwọ ọla, tukwasi ya n'ọkọlọtọ ahu: o rue, ma ọ buru na agwọ atawo madu, na ọ di ndu, mb͕e ọ legidere agwọ ọla ahu anya.
10 Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot.
11 Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ọzara ahu nke di n'iru Moab, n'uzọ ọwuwa-anyanwu.
12 Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Zered.