10 Belam we si Chineke, Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, eziteworom ozi, si,
11 Le, ndi ahu nke si n'Ijipt puta, ọ nēkpuchi kwa iru ala: ub͕u a, bia kọcharam ha; eleghi anya m'gēnwe ike ibuso ha agha, m'gāchupu kwa ha.
12 Chineke we si Belam, Esola ha je; abula ndi Israel ọnu; n'ihi na ndi agọziri agọzi ka ha bu.
13 Belam we bilie n'ututu, si ndi-isi Belak, Lanu n'ala-unu: n'ihi na Jehova n'aju ikwe ka m'soro unu je.
14 Ndi-isi Moab we bilie, biakute Belak, si, Belam nāju isoro ayi bia.
15 Belak we ziga kwa ndi-isi ọzọ, di ọtutu, di kwa nsọpuru, kari ndi ahu.
16 Ha we biakute Belam, si ya, Otú a ka Belak nwa Zipoa siri, Biko, ekwela ka ihe b͕ochie gi ibiakutem: