7 Ndi-okenye Moab na ndi-okenye Midian we je, ihe nile iji ju ase di kwa n'aka-ha; ha we biakute Belam, gwa ya okwu nile nke Belak.
8 o we si ha, Nọnu ọnọdu-abali n'ebe a n'abali a, m'gēweghachi-kwa-ra unu okwu, dika Jehova si agwam okwu: ndi-isi Moab we nọyere Belam.
9 Chineke we biakute Belam, si, Òle ndi bu ndikom ndia nọyere gi?
10 Belam we si Chineke, Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, eziteworom ozi, si,
11 Le, ndi ahu nke si n'Ijipt puta, ọ nēkpuchi kwa iru ala: ub͕u a, bia kọcharam ha; eleghi anya m'gēnwe ike ibuso ha agha, m'gāchupu kwa ha.
12 Chineke we si Belam, Esola ha je; abula ndi Israel ọnu; n'ihi na ndi agọziri agọzi ka ha bu.
13 Belam we bilie n'ututu, si ndi-isi Belak, Lanu n'ala-unu: n'ihi na Jehova n'aju ikwe ka m'soro unu je.