3 Belam we si Belak, Guzo onwe-gi n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma ka m'je; eleghi anya Jehova gābia izutem: ma ihe ọ bula Ọ gēme ka m'hu m'gēgosi kwa gi ya. Ọ we je ugwu nke ọhia nādighi.
4 Chineke we zute Belam: ọ we si Ya, Ebe-ichu-àjà asa ahu ka m'doworo n'usoro, m'we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-aja ọ bula.
5 Jehova we tiye okwu n'ọnu Belam, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.
6 Ọ we jeghachikuru ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya onwe-ya na ndi-isi Moab nile.
7 O we tua ilu-ya, si,N'Eram ka Belak nēsi dutem,Eze Moab si n'ugwu Iru-anyanwu dutem: si,Bia, buaram Jekob ọnu,Bia kwa, wesa Israel iwe.
8 Gini, m'gākọcha? Chineke akọchaghi.Gini kwa m'gēwe iwe? Jehova eweghi iwe.
9 N'ihi na n'elu oké nkume ndia ka m'si ahú ya,Ọ bu kwa n'ugwu ntà ndia ka m'si ekiri ya:Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche,Ọ dighi-agu onwe-ya n'etiti mba nile.