9 N'ihi na n'elu oké nkume ndia ka m'si ahú ya,Ọ bu kwa n'ugwu ntà ndia ka m'si ekiri ya:Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche,Ọ dighi-agu onwe-ya n'etiti mba nile.
10 Ònye gutaworo ájá Jekob,Na ọnu-ọgugu nke otù uzọ n'uzọ anọ nke Israel?Ka mu onwem nwua, ọnwu nke ndi ziri ezi,Ka ikpe-azum di kwa ka nke ya!
11 Belak we si Belam, Gini ka i meworom? ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kutere gi, ma, le, i gọziwo ha nke-uku.
12 Ọ we za, si, Ihe Jehova nētiye n'ọnum, ọ̀ bughi nka ka m'gēlezi anya ikwu?
13 Belak we si ya, Biko, sorom je n'ebe ọzọ, ebe i gēsi hu ha; nání nsọtu-ha ka i gāhu, ma i gaghi-ahu ha nile: gi kọcha-kwa-ram ha site n'ebe ahu.
14 Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.
15 Ọ si Belak, Guzo onwe-gi n'ebe a n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma mu onwem gēzute Jehova n'ebe ahu.