20 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu: uzọ atọ n'uzọ iri ka unu gāchu bayere otù oke-ehi, ọ bu kwa uzọ abua n'uzọ iri ka unu gāchu bayere ebulu ahu;
21 ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, ka unu gāchu bayere nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu;
22 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu.
23 Unu gāchu ndia nāgughi àjà-nsure-ọku ututu, nke bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum.
24 Dika ihe ndia si di ka unu ganāchu kwa-ubọchi, ubọchi asa, nri nke àjà-ọku, nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova: agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà ihe-ọṅuṅu-ya.
25 N'ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.
26 Ọzọ, n'ubọchi nkpuru mbu, mb͕e unu nēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu n'ememe izú asa nke ubọchi asa unu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje: