Ọnu-Ọgugu 28:8-14 IGBOB

8 Nwa-aturu nke-ọzọ ka i gāchu kwa n'etiti ehihie na anyasi: dika onyinye-inata-iru-ọma enyere n'ututu, na dika àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, otú a ka i gēme ya, ibu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere jehova.

9 N'ubọchi-izu-ike kwa: umu-aturu abua nke b͕ara otú arọ, nke zuru oké, na uzọ abua n'uzọ iri nke otú ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-oma, nke agwara manu, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya:

10 nka bu àjà-nsure-ọku ubọchi-izu-ike kwa-ubọchi-izu-ike, tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

11 Ọzọ, na nmalite ọnwa-unu nile unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè;

12 na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu oke-ehi ọ bula; na uzọ abua n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu otù ebulu;

13 na otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu nwa-aturu ọ bula; ọ bu àjà-nsure-ọku, ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.

14 Àjà-ihe-ọṅuṅu-ha gābu kwa nkera otù hin manya-vine iji chu otú oke-ehi, na otú uzọ n'uzọ atọ nke hin iji chu ebulu ahu, na otù uzọ n'uzọ anọ nke hin iji chu otù nwa-aturu: nka bu àjà-nsure-ọku ọnwa kwa-ọnwa anēsure n'ọnwa nile nke arọ.