14 Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, si,
15 Gukọta umu Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru ka i gāgukọta ha.
16 Moses we gukọta ha n'okwu-ọnu Jehova, dika enyere ya iwu.
17 Ndia bu kwa umu-ndikom Livai n'aha-ha; Giashon, na Kohat, na Merari.
18 Ndia bu kwa aha umu-ndikom Giashon dika ab͕uru nile ha si di; Libni na Shimai.
19 Umu-ndikom Kohat kwa dika ab͕uru nile ha si di; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.
20 Umu-ndikom Merari kwa dika ab͕uru nile ha si di; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.