39 Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova, dika ab͕uru nile ha si di, ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na ise.
40 Jehova we si Moses, Gukọta umu-ndikom nile eburu uzọ muru umu Israel, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, guta kwa ọnu-ọgugu aha-ha.
41 I gēwe-kwa-ram ndi Livai (Mu onwem bu Jehova) n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel; na anu-ulo ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti anu-ulo umu Israel.
42 Moses we gukọta umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, dika Jehova nyere ya iwu.
43 Ndikom nile eburu uzọ mu, n'onu-ọgugu aha, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na ọgu iri-na-atọ na iri na atọ.
44 Jehova we gwa Moses okwu, si,
45 Were ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, were kwa anu-ulo ndi Livai n'ọnọdu anu-ulo-ha: ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere; Mu onwem bu Jehova