18 Ma umu-ntakiri nile n'etiti ndinyom, ndi nāmaghi ndina nwoke, menu ka ha diri unu ndu.
19 Ma unu onwe-unu, manu ulo-kwū-unu n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: onye ọ bula nke b͕uworo madu, na onye ọ bula nke metuworo onye eb͕uru eb͕u aru, wepunu nmehie n'aru-unu n'ubọchi nke-atọ na n'ubọchi nke-asa, unu onwe-unu na ndi unu dọtaworo n'agha.
20 Ma uwe ọ bula, na ihe akpukpọ ọ bula, na ihe ọ bula eji aji ewu me, na ihe osisi ọ bula, unu gēwepu nmehie bayere ha n'aru-unu.
21 Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si ndikom nke usu-ndi-agha ahu ndi nābà n'agha ahu, Nka bu ukpuru iwu ahu nke Jehova nyere Moses n'iwu:
22 otú ọ di, ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, na b͕amb͕am, na opù,
23 bú ihe ọ bula nke gānagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga n'ọku ọ gādi kwa ọcha; nání, agēwere miri nke idi-na-nsọ wepu nmehie-ya: ma ihe ọ bula nke nāgaghi-anagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga nime miri.
24 Unu gāsu kwa uwe-unu n'ubọchi nke-asa, unu gādi kwa ọcha, emesia unu gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.