23 bú ihe ọ bula nke gānagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga n'ọku ọ gādi kwa ọcha; nání, agēwere miri nke idi-na-nsọ wepu nmehie-ya: ma ihe ọ bula nke nāgaghi-anagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga nime miri.
24 Unu gāsu kwa uwe-unu n'ubọchi nke-asa, unu gādi kwa ọcha, emesia unu gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.
25 Jehova we gwa Moses okwu, si,
26 Guta ọnu-ọgugu ihe-nweta, bú nke adọtara n'agha, ma n'etiti madu ma n'etiti anu-ulo, gi onwe-gi, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nke ndi bu nna nzukọ a:
27 kera ihe-nweta ahu; n'etiti ndi nēbu agha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha, na nzukọm nile:
28 unu gānara kwa n'aka ndi-agha ahu, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ahu, útù ibuliri Jehova: otù nkpuru-obi nime nnù nkpuru-obi na ọgu ise, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu;
29 na nkera-ha ka unu gānara ya, nye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ bu àjà-nbuli Jehova