27 kera ihe-nweta ahu; n'etiti ndi nēbu agha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha, na nzukọm nile:
28 unu gānara kwa n'aka ndi-agha ahu, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ahu, útù ibuliri Jehova: otù nkpuru-obi nime nnù nkpuru-obi na ọgu ise, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu;
29 na nkera-ha ka unu gānara ya, nye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ bu àjà-nbuli Jehova
30 Na nkera nke umu Israel ka i gānara kwa otù ihe anaputara n'ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu, bú nime anu-ulo nile, i gēnye kwa ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova.
31 Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we me dika Jehova nyere Moses iwu.
32 Ma ihe-nweta ahu, bú ihe fọduru n'ihe-nluta nke ndi usu-ndi agha lutara n'agha, bu orú nnù aturu ọgu uzọ anọ na uzọ anọ, na nnù asa, na ọgu iri,
33 ehi di kwa orú nnù uzọ iteghete;