36 Nkera ahu, nke bu òkè nke ndi nāpu ba n'usu-ndi-agha, we di n'ọnu-ọgugu ìgwè ewu na aturu orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise:
37 útù atùru Jehova, nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, we di nnù na ọgu iri-na-atọ, na iri na ise.
38 Ehi di kwa orú nnù uzọ anọ na nnù iri; utu aturu Jehova site na ha we di ọgu atọ na iri na abua.
39 Inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise; utu-ha aturu Jehova we di ọgu atọ na otù.
40 Madu di kwa orú nnù uzọ abua; utu aturu Jehova site na ha we di orú madu na iri na abua.
41 Moses we nye Eleeza, bú onye-nchu-àjà, utu ahu, nke bu àjà-nbuli Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu.
42 Moses we nara na nkera nke umu Israel, nke Moses kerara site na ihe ndikom nēbu agha,