45 inyinya-ibu di orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise,
46 madu di orú nnù uzọ abua;)
47 Moses we nara na nkera nke umu Israel otù ihe anaputara n'ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime anu-ulo, ọ we nye ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.
48 Ndi-nlekọta ndi nēlekọta usu nile nke nnù ndikom nke usu-ndi-agha abua na ọgu iri, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, we bia nso Moses:
49 ha si Moses, Ndi-orù-gi agutawo ọnu-ọgugu ndi-agha nke di n'aka-ayi, ma ọ dighi otù nwoke puru na ngukọta-ayi.
50 Ayi ewetawo kwa nso ihe iji biaru nso Jehova, ihe nwoke ọ bula chọtaworo, ihe ọla-edo, bú iyab͕a-ukwu, na ọla-aka, na nb͕a-aka-akàrà, na nb͕a-aka-nti, na ihe anēyi n'olu, ikpuchiri nkpuru-obi-ayi nmehie-ha n'iru Jehova.
51 Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we nara ha ọla-edo ahu, bú ihe nile akpuru akpu.