10 Iwe Jehova we di ọku n'ubọchi ahu, Ọ we ṅua iyi, si,
11 Ndikom ahu ndi nēsi n'ala Ijipt rigoputa, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru Abraham, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, iyi inye ha; n'ihi na ha esozughm n'azu:
12 ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, bú onye Kenizait, na Joshua nwa Nun: n'ihi na ha esozuwo Jehova n'azu.
13 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we me ka ha nāṅaghari n'ọzara ọgu arọ abua, rue mb͕e ọb͕ọ ahu nile, nke nēme ihe ọjọ n'anya Jehova, gwusiri.
14 Ma, le, unu ebiliwo n'ọnọdu nna-unu-hà, nmuba nke ndikom, bú ndi-nmehie, iwere idi-ọku ọzọ tukwasi n'idi-ọku iwe Jehova megide Israel.
15 Mb͕e unu gēsi n'iso Ya n'azu laghachi, Ọ gārapu kwa ha n'ọzara nka; unu gēbibi kwa ndi nka nile.
16 Ha we biakute ya nso, si, Ogige ìgwé ewu na aturu ka ayi gēwuru anu-ulo-ayi n'ebe a, wu-kwa-ra umu-ntakiri-ayi obodo: