2 umu Gad na umu Reuben we bia, gwa Moses, gwa kwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gwa kwa ndi-isi nzukọ Israel, okwu, si,
3 Atarot, na Dibon, na Jeza, na Nimra, na Heshbon, na Eleale, na Seban, na Nebo, na Beon,
4 bú ala nke Jehova tib͕uru n'iru nzukọ Israel, ala anu-ulo ka ọ bu, ma ndi-orù-gi nwere anu-ulo.
5 Ha si kwa, Ọ buru na ayi ahutawo amara n'iru gi, ka enye ndi-orù-gi ala nka ibu ihe-onwunwe; emela ka ayi gabiga Jọdan.
6 Moses we si umu Gad na umu Reuben, Umu-nne-unu, hà gābà n'agha ahu, unu onwe-unu ewe nọdu n'ebe a?
7 Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu nēme ka obi umu Israel ju igabiga ba n'ala ahu Jehova nyeworo ha?
8 Otú a ka nna-unu-hà mere, mb͕e m'siri n'ala Kedesh-banea ziga ha ihu ala ahu.