21 ọ buru kwa na onye ọ bula nime unu nke ejikere agabiga Jọdan n'iru Jehova, rue mb͕e Ọ gānapu ndi-iro-Ya ala-ha n'iru Ya,
22 ewe buda ala ahu n'iru Jehova: emesi kwa unu gālata, we buru ndi ikpe nāmaghi site n'aka Jehova, site kwa n'aka Israel; ala nka ewe buru unu ihe-onwunwe n'iru Jehova.
23 Ma ọ buru na unu emeghi otú a, le, unu emehiewo megide Jehova: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu.
24 Unu wuere onwe-unu obodo ufọdu ebe umu-ntakiri-unu gēbi, wu-kwa-ra ìgwé ewu na aturu-unu ogige; me-kwa-nu ihe nēsi n'ọnu-unu puta.
25 Umu Gad na umu Reuben we gwa Moses okwu, si, Ndi-orù-gi gēme dika onye-nwem nēnye iwu.
26 Umu-ntakiri-ayi, na ndinyom-ayi, na anumanu-ayi, na anu-ulo-ayi nile, gānọ n'ebe ahu n'obodo nile nke Gilead:
27 ma ndi-orù-gi gāgabiga, onye ọ bula nke ejikere iso usu-ndi-agha, n'iru Jehova ibu agha, dika onye-nwem nēkwu.